6 Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam.
7 O rue, mb͕e ha batara n'etiti obodo, na Ishmael nwa Netanaia b͕uru ha, tubà ha n'etiti olùlù, ya onwe-ya na ndikom ndi ya na ha nọ.
8 Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha.
9 Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n'akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n'ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.
10 Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.
11 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere,
12 ha we chiri ndikom-ha nile, je ibuso Ishmael nwa Netanaia agha, ha we chọta ya n'akuku miri bara uba nke di na Gibeon.