3 Donu ọta na ọta uku n'usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha.
4 Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.
5 Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
6 Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.
7 Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.
8 Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n'amaghari: o we si, M'gārigo, kpuchie uwa; m'gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n'iyì.
9 Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.