42 Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.
43 Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
44 Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
45 N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu.
46 Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n'iyì: n'ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n'agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n'agha.