11 N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12 Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu:
13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.
14 N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.
15 Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.
16 Àkpà-àkú-ha di ka ílì ghere oghe, ha nile bu ndi-dike.
17 Ha gērichapu kwa owuwe-ihe-ubi-gi, na nri-gi, nke umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri: ha gērichapu ìgwè ewu na aturu-gi na ìgwè ehi-gi: ha gērichapu osisi vine gi na osisi fig i: ha gēji mma-agha titu obodo-gi nile ewusiri ike, nke gi onwe-gi nātukwasi ha obi.