7 M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.
8 Inyinya azùru azù nke-oma nke nāb͕à nne-inyinya ka ha bu: nwoke ọ bula nime ha nēbeso nwunye madu-ibe-ya.
9 M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?
10 Rigonu n'elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n'ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu.
11 N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12 Ha agọnariwo Jehova, si, Ọ bughi Ya; ihe ọjọ agaghi-abiakwasi kwa ayi; ayi agaghi-ahu kwa mma-agha na oké unwu:
13 ndi-amuma gāghọ kwa ifufe, okwu-Ya adighi kwa nime ha: otú a ka agēme ha.