17 Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.
18 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje iji nmehie-ya leta eze Babilon, leta kwa ala-ya, dika M'jiworo nmehie eze Asiria leta ya.
19 M'gēme kwa ka Israel lata n'ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n'ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.
20 N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.
21 Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.
22 Olu agha di n'ala nka, na olu ntipia uku.
23 Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku n'etiti mba nile!