52 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n'ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè.
53 Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
54 Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!
55 n'ihi na Jehova nāpunara Babilon ihe-ya, Ọ nēme kwa ka oké olu si nime ya la n'iyì; nmali-miri nile ha we bib͕ọ dika ọtutu miri, nkpọtu nke olu-ha akpọtuwo:
56 n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.
57 M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
58 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n'ọlu n'efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n'ọlu itiye n'ọku: ike ewe gwu ha.