8 Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko; ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.
9 Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla n'ala Hemat; o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.
10 Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.
11 O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n'ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya.
12 Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadreza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, onye guzoro n'iru eze Babilon, batara na Jerusalem:
13 o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.
14 Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.