1 Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.
2 Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M'gēme ka ọ la n'iyì.
3 Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n'akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n'ọnọdu nke aka ya.
4 Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.