10 Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.
11 Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.
12 Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n'otù: n'ihi na M'gēseti akam n'aru ndi bi n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
13 N'ihi na site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n'ugha.
14 Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.
15 Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.
16 Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.