9 Ùnu ganēzu ori, nēb͕u madu, nākwa iko, nāṅu iyi ugha, nēsurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nējeso chi ọzọ di iche iche nke unu nāmaghi,
10 we bia guzo n'irum n'ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile?
11 Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n'anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12 Otú ọ di, biko, jeruenu ọnọdum nke di na Shailo, ebe M'mere ka aham biri na mbu, hunu ihe M'mere ya n'ihi ihe ọjọ nke ndim, bú Israel.
13 Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh:
14 M'gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M'gēme kwa ọnọdu a nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M'gēme ha dika M'gēme ha dika M'mere Shailo.
15 M'gēsi kwa n'irum tufue unu, dika M'tufuru umu-nna-unu nile, bú nkpuru nile nke Efraim.