2 ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n'elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.
3 N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.
4 Dika inyinya si di n'ile ha anya, otú a ka ha di n'ile ha anya; e, dika ndi-inyinya, otú a ka ha nāb͕a ọsọ.
5 Dika olu ọtutu ub͕ọ-ala n'elu ugwu ka ha nāmali amali, dika olu ire-ọku nke nēripia ahihia-ọka, dika otù ndi nke nwere ume nke edoworo n'usoro agha.
6 N'iru ha ndi nile di iche iche nāb͕ali: iru nile achagharisiwo.
7 Dika ndi-dike ka ha nāb͕a ọsọ; dika ndi-agha ka ha nārigo mb͕idi; onye ọ bula n'uzọ-ya nile, otú a ka ha nāga ije, ha adighi-agwab͕u kwa agwab͕u n'ojije nile ha.
8 Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n'uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n'etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha.