11 Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.
12 Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.
13 Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.
14 N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu.
15 Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.