14 Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.
15 Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa.
16 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.
17 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.
18 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?
19 Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.
20 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.