9 ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):
10 ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna:
11 ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri.
12 Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.
13 Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron).
14 Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.
15 Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa.