1 Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.
2 Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.
3 Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.
4 Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.
5 Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan;