3 Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.
4 Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.
5 Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan;
6 n'ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n'etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya.
7 Ókè-ala Manase we si n'Asha rue Mikmetat, nke di n'iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n'En-tapua.
8 Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase.
9 Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n'etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n'akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n'oké osimiri: