3 na Haza-shual, na Bala, na Ezem;
4 na Eltolad, na Betul, na Họma;
5 na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa;
6 na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha:
7 na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha:
8 na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.
9 Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.