11 Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.
12 M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.
13 M'we nye unu ala nke i nādọb͕ughi onwe-gi n'ọlu nime ya, na obodo nke unu nēwughi, unu we biri nime ha; ubi-vine na ubi-olive nke unu nākughi ka unu nēri nkpuru-ha.
14 Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.
15 Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.
16 Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè;
17 n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha: