6 M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.
7 Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.
8 M'we me ka unu ba n'ala ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan; ha we buso unu agha: M'we nye ha n'aka-unu, unu we nweta ala-ha; M'we kpochapu ha n'iru unu.
9 Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, we bilie buso Israel agha; o we ziga kpọ Belam nwa Beoa ikọcha unu:
10 ma ekweghm ige Belam nti; o we nāgọzi unu agọzi: M'we naputa unu n'aka-ya.
11 Unu we gabiga Jọdan, biarue Jeriko: ndi-nwe Jeriko we buso unu agha, bú ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; M'we nye ha n'aka-unu.
12 M'we ziga ebu n'iru unu, nke chupuru ha n'iru unu, bú eze abua nke ndi-Amorait; ọ bughi na mma-agha-gi, ọ bughi kwa n'uta-gi.