10 Ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ahu nēguzo kwa n'etiti Jọdan, rue mb͕e emezuru okwu ahu nile nke Jehova nyere Joshua n'iwu igwa ndi Israel, dika ihe ahu nile si di nke Moses nyere Joshua n'iwu: ndi Israel we me ngwa gabiga.
11 O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.
12 Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:
13 dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.
14 N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.
15 Jehova we gwa Joshua okwu, si,
16 Nye ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ihe-àmà iwu, ka ha si na Jọdan rigota.