5 mu onwem, na ndi nile mu na ha nọ, gābiaru obodo ahu nso: ọ gēru kwa, mb͕e ha gāputa izute ayi, dika na mb͕e mbu, na ayi gāb͕alaga n'iru ha;
6 ha gāputa n'azu ayi, rue mb͕e ayi gādọpu ha n'obodo; n'ihi na ha gāsi, Ha nāb͕alaga n'iru ayi, dika na mb͕e mbu; ayi gāb͕alaga kwa n'iru ha:
7 unu onwe-unu gēsi kwa n'oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n'aka-unu.
8 Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.
9 Joshua we zipu ha: we je n'oruru-nbì ahu, we nọdu n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n'etiti ndi Israel.
10 Joshua we bilie n'isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n'iru ndi Israel, rue Ai.
11 Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n'etiti ya na Ai.