7 unu onwe-unu gēsi kwa n'oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n'aka-unu.
8 Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.
9 Joshua we zipu ha: we je n'oruru-nbì ahu, we nọdu n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n'etiti ndi Israel.
10 Joshua we bilie n'isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n'iru ndi Israel, rue Ai.
11 Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n'etiti ya na Ai.
12 O we chiri ihe ra ka nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, do ha n'oruru-nbì n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu.
13 Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n'akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n'etiti ndagwurugwu ahu n'abali ahu.