5 N'ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n'ala ruru madu n'ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova.
6 Unu abusala okwu dika miri, otú a ka ha nābusa okwu. Ha agaghi-abusará ndia okwu: okwu-ha nke nētiye n'ọnọdu-ihere agaghi-ewezuga onwe-ha.
7 Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?
8 Ma nnyahuru ka ndim nēbili ọtọ ibu onye-iro: ọ bu n'uwe-nb͕okwasi ka unu nēyipucha uwe-nwuda n'aru ndi nāgabiga na ntukwasi-obi, bú ndi si n'agha echighari.
9 Ndinyom nke ndim ka unu nāchupu n'ulo ihe-utọ nile ha; umu-ntakiri-ha ka unu nānapu ebubem rue mb͕e ebighi-ebi.
10 Bilienu, la; n'ihi na nka abughi izu-ike-unu: n'ihi iru-árú nke nemebi emebi, ọbuná nmebi di irè.
11 Ọ buru na onye ọ bula nke nējeghari n'ifufe na okwu-ugha ekwu okwu-ugha, si, M'gābusara gi okwu dika miri bayere manya-vine, baye-kwa-ra ihe-ọṅuṅu nāba n'anya; ọ gābu kwa onye nābusara ndi nka okwu dika miri.