Maika 3 IGBOB

1 M'we si, Biko, nurunu, unu ndi-isi Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel: ọ̀ bughi ihe diri unu, bú imara ikpé?

2 unu ndi nākpọ ezi ihe asì, ndi nāhu kwa ihe ọjọ n'anya; ndi nādọwapu ha akpukpọ n'aru, na anu-aru-ha n'ọkpukpu nile ha;

3 ndi nēri kwa anu-aru ndim; ọ bu kwa akpukpọ-aru-ha ka ha b͕aworo ha, ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ha b͕ajisiworo: e, ha eb͕ubisiwo ha dika ihe agēsi n'ite, na dika anu n'etiti ite ọla.

4 Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ.

5 Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere ndi-amuma ahu ndi nēdufu ndim; ndi ji ezé-ha ata aru, we kpọ, si, Udo; ma onye ọ bula nke nādighi-etiye ihe n'ọnu-ha, ha ewe do agha nsọ megide ya;

6 N'ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n'elu ha.

7 Ihere gēme kwa ndi-ọhù, ndi nāju ase gēnwe kwa iru-ihere; e, ha gēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-ha, ha nile: n'ihi na ọ dighi ọziza Chineke nāza.

8 Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.

9 Biko, nurunu nka, unu ndi-isi ulo Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel, ndi nākpọ ikpé ziri ezi ihe-árú, ọ bu kwa izi-ezi nile ka ha nēme ka ọ b͕agọrọ ab͕agọ.

10 Ndi ji ọbara èwu Zaion, ji kwa ajọ omume ewu Jerusalem.

11 Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.

12 N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7