12 Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n'ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma.
13 Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu.
14 Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.
15 Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.
16 N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.
17 Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N'isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n'anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?