Malakai 3 IGBOB

1 Le, Mu nēziga onye-ozim, o gēdozi kwa uzọ n'irum Onye-nwe-unu ahu unu onwe-unu nāchọ gābiaru ulo uku Ya na mberede; ọbuná Onye-ozi ọḅuḅa-ndu ahu, Onye ihe-Ya nātọ unu utọ, le Ọ nābia, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

2 Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:

3 Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume.

4 Onyinye-inata-iru-ọma nke Juda na Jerusalem gātọ kwa Jehova utọ, dika n'ubọchi mḅe ebighi-ebi gara aga, na dika n'arọ nile gara aga.

5 M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

6 N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.

7 Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?

8 Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.

9 Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.

10 Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.

11 M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

12 Ọ bu kwa Ndi ihe nāgara nke-ọma ka mba nile gākpọ unu: n'ihi na unu onwe-unu gābu ala nke nātọ utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.

13 Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?

14 Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?

15 Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.

16 Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya.

17 Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya.

18 Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4