5 M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
6 N'ihi na Mu onwem, bú Jehova, aḅanweghi; ya bu na emeghi ka unu onwe-unu gwusia, umu Jekob.
7 Site n'ubọchi nile nke nna-unu-hà ka unu wezugaworo onwe-unu n'ukpurum nile, unu edebeghi kwa ha. Laghachikutenum, Mu onwem gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi gālaghachi?
8 Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.
9 Ọbubu-ọnu ka eji abu unu onwe-unu; ọ bu kwa Mu ka unu onwe-unu nāpunara ihe, bú mba nka nile.
10 Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.
11 M'gābasi-kwa-ra ihe nēripia eripia nba ike n'ihi unu, ọ gaghi-ebibi-kwa-ra unu nkpuru ala-ubi-unu; osisi vine unu agaghi-atupu nkpuru-ya n'ubi tutu oge-ya eru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.