12 Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha.
13 Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n'ihi ya M'gaghi-azọputa kwa unu ọzọ.
14 Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.
15 Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta.
16 Ha we si n'etiti ha wezuga chi ala ọzọ nile, fè Jehova òfùfè: nkpuru-obi-Ya enweghi kwa ntachi-obi n'ihi ọnọdu ọjọ nke Israel.
17 Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa.
18 Ndi ahu, bú ndi-isi Gilead, we sirita onwe-ha, Ònye bu nwoke ahu nke gāmalite ibuso umu Amon agha? ọ gāghọrọ ndi nile bi na Gilead isi.