Ndi-Ikpe 5 IGBOB

1 Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,

2 N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel,N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,Gọzienu Jehova.

3 Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.

4 Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije,Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.

5 Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.

6 N'ubọchi Shamga nwa Anat,N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.

7 Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.

8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche;Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:Àhuru ọta ma-ọbu ubeN'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?

9 Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:Gọzienu Jehova.

10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,Unu na ndi nēje ije n'uzọ,Tugharinu uche.

11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.

12 Teta, teta, Debora;Teta, teta, kwue okwu abù:Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.

13 Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.

14 Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.

15 Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nzube obi di.

16 N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?Na miri-iyi nile nke ReubenKa oké nnyocha obi di.

17 Gilead biri n'ofè Jọdan:Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.

18 Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.

19 Ndi-eze biara, bū agha;Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,Nime Teanak n'akuku miri Megido:Ọ dighi urù ego ha nara.

20 N'elu-igwe ka ha si bū agha,Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.

21 Miri-iyi Kaishon bupuru ha,Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.Nkpuru-obim, i nāzọda ike.

22 Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ikeSite n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.

23 Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.

24 Agāgọzi Jael kari ndinyom,Bú nwunye Heba onye-Kenait,Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.

25 Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.

26 Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike;O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi,O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.

27 N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.

28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe,Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?

29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,

30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi;Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?

31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova:Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya.Ala we di jū ọgu arọ abua.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21