24 Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta.
25 Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli?
26 Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu?
27 Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon.
28 Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya.
29 Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon.
30 Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie,