27 Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon.
28 Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya.
29 Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon.
30 Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie,
31 o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m'siri n'umu Amon lata n'udo, Jehova gēnwe ya, m'gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.
32 Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n'aka-ya.
33 Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n'Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n'iru umu Israel.