36 Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n'ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-gi, bú n'aru umu Amon.
37 O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m'we je rida rue n'elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m'nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem.
38 Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu.
39 O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel,
40 na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.