4 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha.
5 O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob:
6 ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha.
7 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u?
8 Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead.
9 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m'lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n'irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi?
10 Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di.