13 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya.
14 Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.
15 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi.
16 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
17 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?
18 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?
19 Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.