1 O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba.
2 Nna-ya we si, Asirim n'ezie na i kpọrọ ya asì nke-uku; m'we nye ya nwoke-ibe-gi: nwa-nne-ya nke-ntà, ọ̀ dighi nma kari ya? biko, ka ọ nọchiri gi n'ọnọdu ya.
3 Samson we si ha, Otù ub͕ò a m'gābu onye ikpe nāmaghi kari ndi Filistia, ọ bu ezie na mu onwem nēme ha ihe ọjọ.
4 Samson we je nwude ọgu nkita-ọhia iri-na-ise, chiri ọwa, che ọdudù iru, tiye otù ọwa n'etiti ọdudù abua n'ab͕ata ha.
5 Ọ we muye ọku n'ọwa nile, zipu ha ga n'ọka guzoro eguzo nke ndi Filistia, we sure ma obo ọka ma ọka guzoro eguzo, ha na ubi-olive.
6 Ndi Filistia we si, Ònye meworo nka? Ha si, Samson, di nwa onye Timna, n'ihi na ọ narawo ya nwunye-ya, nye ya nwoke-ibe-ya. Ndi Filistia we rigo, kpọre ya na nna-ya n'ọku.
7 Samson we si ha, Ọ buru na unu eme otú a, aghaghm ibọrọ onwem ọ́bọ n'aru unu, ma emesia m'gāgha.