9 Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m'bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m'gāchọta ọnọdu.
10 Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime.
11 Onye Livai we kwere ibiri n'ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom.
12 Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika.
13 Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.