3 Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.
4 Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n'ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
5 O rue, n'ubọchi nke-anọ, na ha biliri n'isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n'obi-gi, ma emesia unu gāla.
6 Ha we nọdu, rikọ ihe, ṅukọ kwa ihe-ọṅuṅu, ha abua: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si nwoke ahu, Biko, kwere, nọ ọnọdu-abali, ka obi-gi di kwa nma.
7 Nwoke ahu we bilie ila; ma ọgọ-ya rugidere ya, o we chigharia nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
8 O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.
9 Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.