3 M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà.
4 O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá.
5 Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu.
6 Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.
7 Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.
8 Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.
9 Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash.