4 O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá.
5 Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu.
6 Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.
7 Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.
8 Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.
9 Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash.
10 Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.