12 Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu?
13 Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel.
14 Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha.
15 Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.
16 N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.
17 Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.
18 Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.