21 hu-kwa-nu, ma, le, ọ buru na umu-ndinyom Shailo aputa ite egwú nime otiti-egwú-ha, unu gēsi kwa n'ubi-vine puta, nwudere onwe-unu, nwoke ọ bula nwunye-ya, site n'umu-ndinyom Shailo, la n'ala Benjamin.
22 O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a.
23 Umu Benjamin we me otú a, kuru nwunye, dika ọnu-ọgugu-ha si di, site na ndinyom nēte egwū, ndi ha nāpunara ndi Shailo: ha we je lata n'ihe-nketa-ha, wue obodo-ha, biri nime ha.
24 Umu Israel we si n'ebe ahu la na mb͕e ahu, nwoke ọ bula ọ lakuru ebo-ya, lakuru ab͕uru-ya, ha we si n'ebe ahu pua, nwoke ọ bula rue ihe-nketa-ya.
25 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel, onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.