9 Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.
10 Nzukọ Israel we ziga n'ebe ahu orú nnù ndikom na nnù iri sitere na ndi bu dìnkpà, ha we nye ha iwu, si, Jenu, were ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi na Jebesh-gillead, ha na ndinyom na umu-ntakiri.
11 Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya.
12 Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean.
13 Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo.
14 Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.
15 Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile.