13 O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu.
14 Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.
15 Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma.
16 Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n'okpuru uwe-nwuda-ya n'apata-ukwu aka-nri ya.
17 Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku.
18 O rue, mb͕e o wetasiri onyinye-inata-iru-ọma ahu nso, na o zilagara ndi nēbu onyinye-inata-iru-ọma ahu.
19 Ma ya onwe-ya si n'arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m'nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n'ebe ọ nọ pua.