1 Umu Israel we me kwa ọzọ ihe ọjọ n'anya Jehova, mb͕e Ihud nwusiri.
2 Jehova we renye ha n'aka Jebin, bú eze Kenean, onye bu eze nime Hezoa; onye-isi usuu-ndi-agha-ya bu kwa Sisera, ma onye ahu bi nime Haroshet nke mba di iche iche ọzọ.
3 Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.
4 Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu.
5 Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe.