10 Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.
11 Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh.
12 Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa.
13 Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.
14 Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu.
15 Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya.
16 Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.