7 M'gadọ kwa Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Jebin, rue gi aru, rue mìri-iyi Kaishon, ya na ub͕ọ-ala-ya na ìgwè ndi-ya; M'gēnye kwa ya n'aka-gi.
8 Berak we si ya, Ọ buru na i sorom je, m'gēje kwa: ma ọ buru na i soghm je, m'gaghi-eje.
9 Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n'ije nke gi onwe-gi nēje; n'ihi na ọ bu n'aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh.
10 Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.
11 Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh.
12 Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa.
13 Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.