28 Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe,Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?
29 Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,
30 Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi;Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?
31 Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova:Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya.Ala we di jū ọgu arọ abua.