8 na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta:
9 M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi nile nēmeb͕u unu, M'we chupu ha n'iru unu, nye unu ala-ha:
10 M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.
11 Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian.
12 Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà.
13 Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian.
14 Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i?