1 Jerubeal (onye ahu bu Gideon), na ndi nile soro ya, we bilie n'isi-ututu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi Harod: ọmuma-ulo-ikwū Midian we di n'akuku Ugwu ha, site n'ugwu ntà More, nime ndagwurugwu.
2 Jehova we si Gideon, Ndi nke nēso gi baram uba inye Midian n'aka-ha, ka Israel we ghara inya isi megidem, si, Akam azọputawom.
3 Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.
4 Jehova we si Gideon, Ndi Israel bara uba rue ub͕u a; me ka ha ridarue miri ahu, M'gānwaputa-kwa-ra gi ha n'ebe ahu: ọ gēru kwa, na onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a gēsoro gi je, ọ bu onye ahu gēsoro gi je; ma onye ọ bula M'gāsi gi, Onye a agaghi-eso gi je, ọ bu onye ahu nāgaghi-eje.